Isaiah 54

Ebube dị nʼihu nye Zayọn

1“Bụọ abụ, gị nwanyị aga,
gị onye na-amụtaghị nwa;
tie mkpu ọṅụ, tiwakwaa olu abụ,
gị onye ime nwa na-emetụbeghị;
nʼihi na ụmụ nwanyị ahụ a hapụrụ naanị ya ga-adị ọtụtụ
karịa ụmụ nke nwanyị nwere di,”
Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.
2“Mee ka ebe ụlọ ikwu gị saa mbara,
gbasapụ akwa mgbochi ụlọ ikwu gị,
egbochila gbasapụ aka;
mee ka ụdọ gị dị ogologo,
meekwa ka o sie ike nke ọma.
3Nʼihi na nʼaka nri na nʼaka ekpe ka ị ga-agbasa gaa;
ụmụ gị ga-achụpụ mba dị iche iche site nʼala ha,
bichikwaa nʼobodo ha niile dakpọsịrị adakpọsị, nke tọgbọrọ nʼefu.

4“Atụla egwu, nʼihi na ihere agaghị emekwa gị ọzọ.
Ị gaghị abụkwa onye e wedara nʼala.
Ị gakwaghị echeta ihere mere gị mgbe ị bụ nwantakịrị,
na ịta ụta dịrị gị nʼihi ọnwụ di gị.
5Nʼihi na onye kere gị ga-abụrụ gị di.
Aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile;
Onye nsọ Izrel bụ Onye mgbapụta gị,
Chineke nke ụwa niile ka a na-akpọ ya.
6Nʼihi na Onyenwe anyị ga-akpọghachi gị
dịka a ga-asị na ị bụ nwunye a hapụrụ ahapụ, nke ọ na-ewutakwa nʼime mmụọ ya
bụ nwunye alụtara na nwantakịrị,
naanị ka ọ bụrụ onye ajụrụ ajụ,” ka Chineke gị na-ekwu.
7“Naanị nwa mgbe nta ka m hapụrụ gị.
Ma aga m eji obi ebere ukwuu kpọghachikwa gị
8Na nwa oge, esitere m nʼoke iwe na-ewe m
zonarị gị ihu m,
ma site nʼịhụnanya m nke na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
aga m enwe ọmịiko nʼahụ gị.”
Otu a ka Onyenwe anyị, onye mgbapụta gị kwuru.

9“Dịka m si ṅụọ iyi nʼoge Noa sị na m agaghị ekwekwa ka mmiri kpuchie ụwa ọzọ,
bibie ndụ ndị dị nʼime ya,
ana m aṅụkwa iyi ugbu a na mụ agaghị ekwe ka iwe m bịakwasị gị ọzọ.
Agakwaghị m abasiri gị mba ike.
10Nʼihi na a pụrụ iwezuga ugwu ukwu niile,
wezugakwa ugwu nta niile site nʼọnọdụ ha,
ma obi ebere m agaghị esi nʼebe ị nọ pụọ,
agaghị ewezugakwa ọgbụgba ndụ nke udo m,”
ka Onyenwe anyị, onye nwere ọmịiko nʼahụ gị, kwuru.

11“Gị, onye a na-emekpa ahụ, onye oke ikuku ụwa a na-ebugharị, nke onye ọbụla na-adịghị akasị obi,
lee, aga m e ji nkume tọkwọisi wugharịa gị,
jirikwa nkume ọma safaia dị oke ọnụahịa tọọ ntọala gị niile.
12Aga m eji nkume rubi wugharịa akụkụ ụlọ gị niile,
jiri nkume na-egbu nweghenweghe wuo ọnụ ụzọ ama gị niile.
Aga m ejikwa nkume dị oke ọnụahịa wuo mgbidi obodo gị.
13Ụmụ gị niile ga-abụ ndị Onyenwe anyị ga-akụziri ihe.
Udo ha ga-adịkwa ukwu.
14Nʼezi omume ka a ga-eme ka ị guzosie ike.
Mmegbu ga-adịkwa anya site nʼebe ị nọ,
nʼihi ya, ị gaghị atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla.
Ọ dịghị ihe egwu ga-abịaru gị nso,
nʼihi na a ga-ewezuga ha site nʼebe ị nọ.
15Ọ bụrụ na onye ọbụla abịa ịlụso gị ọgụ, ọ siteghị nʼaka m;
onye ọbụla nke na-alụso gị ọgụ ga-abụ onye e meriri emeri.

16“Lee, ọ bụ mụ onwe m kere ọkpụ ụzụ
nke na-eji icheku afụ ọkụ
o ji akpụ ihe agha nke mbibi.
Ọ bụkwa m kere ndị agha ahụ mbibi bụ ọrụ ha.
17Nʼụbọchị ahụ, ọ dịghị ihe agha a kpụrụ megide gị nke ga-adị ire.
Ọzọ, ị ga-emeri ndị niile kpọrọ gị ikpe mmegide.
Nʼihi na nke a bụ ihe nketa dịrị ndị ohu Onyenwe anyị.
Mkpepụta
Mmeri ha maọbụ, ezi omume
ha na-esite na m.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
Copyright information for IboBIU